ỤKPARA NWAMBỊ--Ịgbo poem POETRY VERSES FROM IGBOLAND Written by Mazi Mike Ngozi Osuji Tel;+2348033865418 Email; Osujimichael60@gmail.com Ụkpara m naahị lara ala, Kwaa, kwa jaa mma, Were nne gị kwụọ m ụgwọ, Kwaa, kwa jaa mma, Were nna gị kwụọ m ụgwọ, Kwaa, kwa jaa mma, Gị sị a gị akwụụ m ụgwọ, Egbeleke buru ni gị, Ọgankwọ buru ni gị, ị jewe ejewe kwụọ m ụgwọ, ị lọwa alọwa kwụọ ụgwọ, Kwaa, kwa jaa mma, Ya bụrụ ma Egbeleke ebuteghị gị, Ọgankwọ ga-ebute lịlị gị, Ya bụrụ ma Ọgankwọ ebuteghị gị, Ọsọsọọ miri sọrọ nị gị, sọrọ nị gị, Ya sọrọ nị gị ka ị kwụọ m ụgwọ, Kwaa kwa jaa mma. Ọsọsọ miri sọrọ nị gị k'ịrụgbuo, rụgbuo !, rụgbuo !, Ya sọrọ nị gị k'ịrụgbuo n'me ite ofe nne m, Ya bụrụ ma gị rụgbuo ! rụgbuo, rụgbuo Ọbụ mụ nwa ga-agụta gị n'ite ofe nne m, Ya bụrụ ma m gụta gị, gụta gị , gụta gị, Ma ewere gị mere azụ oru n'ite ofe nnem, Ma ọ sọrọ gị ma ọ sọghị gị, Kwaa kwa jaa mma . Ụkpara niile nọ na ọhịa, ha niile bụ nke nwambi, Ụgụrụbe na Ọtagele...
Get entertained with Ojemba folk stories. read and enjoy!!