ỌNWA NA KPAKPANDO--Igbo Poem
Poetic verses from Igbo land.
Written and performed by
Mazi Michael Ngozi Osuji
Tell; +2348033865418
Email; Osujimichael60@gmail. com
Ọnwa na kpakpando bụrụ anyị ngọzi,
Ịhe Chukwu nyere anyị n'ụwa enwe nkọwa,
Ma nwagbọhọ ma nwaokorobịa, bụ ngọzi,
Ịhe ọma Chukwu meere anyị n'ụwa enwe nkọwa
ịyi niile, na oshimiri niile, ha niile bụ ngọzi,
ịhe Chukwu meere anyị n'ụwa, bụ ịhuọma,
Ụmụ nnụnụ na ụmụ anụmanụ, bụ mmezi,
Ụmụ ụkpara, na ụmụ ololo, bụ ọlụọma .
Nde di anyị, na nde nwụnye anyị, bụ ịhuọma,
Nde nne anyị, na nde nna anyị, bụ mmenye,
Ịkuku ndụ, na miri ọñụñụ, na mmanya,
Ịhe chukwu meere anyị n'ụwa enwe nkọwa,
Chi ojiji, na chi ọbụbọ, ha niile bụ ngọzi,
Mai ngwo, na manu nkwu, Chukwu nyere anyi,
ọmụmụ nwoke, na ọmụmụ nwanyi, bụ ngozi,
Ịheọma Chukwu meere anyị n'ụwa karịrị enyi,
Ụmụ ahụhụ na ụmụ ijiji, ha niile nwere ọrụ,
Ịhe Chukwu jiri kee ha n'uwa, ha niile dị anyị mkpa,
Akwụkwọ ụkazị na mkpakwụkwọ niile nwere ọrụ,
Azụ mmiri na anụmanụ, ha niile di anyị mkpa,
Ọnwa na kpakpando bụ ngọzi,
Ndụ Chukwu nyere anyị n'ụwa , bụ ihuọma,
Onye bara ọnọ tete ụra , nwere ngọzi,
Ụra jiri bụrụ obere ọnwụ n'elu ụwa .
Note; The culture of a man is like his shadows, no man can run away from his own shadows
Click the link below to proceed to the next post.
Comments
Post a Comment