Skip to main content

ỤKPARA NWAMBỊ--IGBO POEM

ỤKPARA NWAMBỊ--Ịgbo poem
POETRY VERSES FROM IGBOLAND
Written by Mazi Mike Ngozi Osuji
Tel;+2348033865418
Email; Osujimichael60@gmail.com

Ụkpara m naahị lara ala, 
Kwaa,  kwa jaa mma,
Were nne gị kwụọ m ụgwọ,
Kwaa, kwa jaa mma,
Were nna gị kwụọ m ụgwọ,
Kwaa, kwa jaa mma,
Gị sị a gị akwụụ m ụgwọ,
Egbeleke buru ni gị,
 Ọgankwọ buru ni gị,
ị jewe ejewe kwụọ m ụgwọ,
ị lọwa alọwa kwụọ ụgwọ,
Kwaa, kwa jaa mma,
Ya bụrụ ma Egbeleke ebuteghị gị,
 Ọgankwọ ga-ebute lịlị gị,
Ya bụrụ ma Ọgankwọ ebuteghị gị,
Ọsọsọọ miri sọrọ nị gị, sọrọ nị gị,
Ya sọrọ nị gị ka ị kwụọ m ụgwọ,
Kwaa kwa jaa mma.
Ọsọsọ miri sọrọ nị gị k'ịrụgbuo, rụgbuo !, rụgbuo !,
Ya sọrọ nị gị k'ịrụgbuo n'me ite ofe nne m,
Ya bụrụ ma gị rụgbuo ! rụgbuo, rụgbuo
Ọbụ mụ nwa ga-agụta gị n'ite ofe nne m,
Ya bụrụ ma m gụta gị, gụta gị , gụta gị,
Ma ewere gị mere azụ oru n'ite ofe nnem,
Ma ọ sọrọ gị ma ọ sọghị gị,
Kwaa kwa jaa mma .

Ụkpara niile nọ na ọhịa, ha niile bụ nke nwambi,
Ụgụrụbe na Ọtagelege, ololo na nwa-akụebe,
Oke niile nọ na ọhịa, ọbụ nwambị nwe ha ncha,
Nwa-odu na nwa-ọgụrụ, tụmadụ uze-na-ọsa,
Azụ niile hi nọ nị ịyị, ha niile bụ nke m,
Nwa-oporo na ayaraọcha, mangala na ayara ojii,
Nwụrụpịrị na Ọsụ-mkpịtị, Sụngu na ịle,
Nke na ekweghị ị bụ nke m,
Ịkuku agụrụ buru ya, buru ya, buru ya , Ịkuku agụrụ buru ya
Ka ọ dakpuo na ime ite ofe nne m .
Ofe ọma nne m na etere m,
Ofe ụgbọgụrụ na mtụrụkpa,
Ọkọrọ-ụgba na ụgụ-manụ,
Ofe-ụha na ofe-ogiri,
M gụta ụkpara, m gụta ayara,
M gụta ịle, m gụta sụngu,
M gụta anụ-oke, m gụta azụ,
Ka nri nne m jiri bụrụ erichaa atabie aka,
Na erichaa, e bie ubiri, bie kọrọrọ .
</div>

Note; The culture of a man is like his shadows, no man can run away from his own shadows.




Click the link below to proceed to the next post.

Click here to visit next post

Comments

Popular posts from this blog

THE SHIVERING ELEPHANT--FOLKTALES FROM IGBOLAND

THE SHIVERING ELEPHANT FOLKTALES FROM IGBOLAND Written by Mazi Michael Ngozi Osuji. Email;  osujimichael60@gmail.com , Tell; +2348033865418. Once upon a time there was a certain elephant that was feeling terribly cold and feverish in the jungle. The cold was so much that the elephant could no longer contain it, and so he needed a shelter and warmth It was the great season of harmatan, and the season had brought with it some form of unbearable cold, and chilling dews, were falling from the sky with the atmosphere covered in thick black smoke.  The chilling cold, forced people to remain indoors within their houses. The people also made fires in their houses in order to keep warmth and to fight the raging cold weather. Meanwhile, there was a hunter who lived in the jungle. He built a hut in the jungle where he lived with his family. Like other families, the hunter also made fires in his hut in order to keep the hut warm and to combat the ragi...

EKE NWE ỌHỊA--IGBO POEM

EKE NWE ỌHỊA---IGBO POEM Written and performed by; Mazi Mikde Ngozi Osuji Tel; +2348033865418 Email; Osujimichael60@gmail.com Eke nwe oke ọhịa, Mgbada nwe ụkwụ ọsọ Ọsọ Mgbada bụ ọsọndụ, ọsọndụ anaghị agwuike Azụ nwe ime mmiri, oshimiri bụ oke iyi Nnụnụ nwe eluigwe, eluigwe bụ ala nnụnụ Ewi nwe ime ọnụ, ime ala bụ ụlọ ewi Elu mkwụ bụ ala ọsa, elu ngwọ bụ ala uze Nkwụoka bụ ụlọ egbe, elu ọjị bụ ulọ ugo Egbe mara mma n'eri ọkụkọ Ugo mara mma n'eri awọ Ndi mmụọ nwe ime abali, abalị di m egwu Mmadụ nwe eluwa, ụbọchị bụ nke ha Mmadụ ketere iri anụ, anụ bụ nri ọnụ Anụmanụ n'ata achara, achara bụ nriọfia Ịhe niile nwere oge, oge eji eme mmemme Ụbọchị bụ oge ọlụlụ, ọlụlụ n'enye ndụ Abali bụ oge ụra, ụra bụ oge nzimike Ufuru bụ nri ụkpara, ụkpara bụ nri nnụnụ Nnụnụ bụ nri agwọ, agwọ bụ nri agụ Agụ bụ eze ọhịa, Agụ anaghị ata achara Achara bụ nri eghu, eghu bụ nri agụ Chineke kere agụ, ama kwe ka ọtaa achara Agụ n'achị obodo, obodo ụmụ anụmanụ Achara bụ...

THE BASTARDIZATION OF THE THRONE OF IGWE IN I GBO LAND

THE BASTARDIZATIOM OF THE THRONE OF IGWE IN IGBOLAND The throne of Igwe or Eze in Igbo land is traditional and ancestral. The Eze stool is meant to be sacred and full of divinity and power. It was the oracle that chose who would be king of his people in Igbo land. The traditional Igbo stool enjoyed unadulterated divinity, and sacrosanctity and power, which had direci spiritual link with the gods. THE IGWE STOOL IS ANCESTRAL AND TRADITIONAL AND NOT POLITICAL The Nze-na-Ọzọ title holders constitute  the king makers whose duty was to prepare the chosen king according to the demand of traditional tenets of the land. A chosen Eze or Igwe was usually subjected to series of oaths,and rituals to prepare him for the onerous task of the Eze or  Igwe stools in Igbo land. A new king could be chosen at infancy according to the wishes of the oracle. Igbo kings were not enthroned by virtue of age, height or wealth but by the dictates of the gods who chooses whoever pleased them i...