ỤKPARA NWAMBỊ--Ịgbo poem
POETRY VERSES FROM IGBOLAND
Written by Mazi Mike Ngozi Osuji
Tel;+2348033865418
Email; Osujimichael60@gmail.com
Ụkpara m naahị lara ala,
Kwaa, kwa jaa mma,
Were nne gị kwụọ m ụgwọ,
Kwaa, kwa jaa mma,
Were nna gị kwụọ m ụgwọ,
Kwaa, kwa jaa mma,
Gị sị a gị akwụụ m ụgwọ,
Egbeleke buru ni gị,
Ọgankwọ buru ni gị,
ị jewe ejewe kwụọ m ụgwọ,
ị lọwa alọwa kwụọ ụgwọ,
Kwaa, kwa jaa mma,
Ya bụrụ ma Egbeleke ebuteghị gị,
Ọgankwọ ga-ebute lịlị gị,
Ya bụrụ ma Ọgankwọ ebuteghị gị,
Ọsọsọọ miri sọrọ nị gị, sọrọ nị gị,
Ya sọrọ nị gị ka ị kwụọ m ụgwọ,
Kwaa kwa jaa mma.
Ọsọsọ miri sọrọ nị gị k'ịrụgbuo, rụgbuo !, rụgbuo !,
Ya sọrọ nị gị k'ịrụgbuo n'me ite ofe nne m,
Ya bụrụ ma gị rụgbuo ! rụgbuo, rụgbuo
Ọbụ mụ nwa ga-agụta gị n'ite ofe nne m,
Ya bụrụ ma m gụta gị, gụta gị , gụta gị,
Ma ewere gị mere azụ oru n'ite ofe nnem,
Ma ọ sọrọ gị ma ọ sọghị gị,
Kwaa kwa jaa mma .
Ụkpara niile nọ na ọhịa, ha niile bụ nke nwambi,
Ụgụrụbe na Ọtagelege, ololo na nwa-akụebe,
Oke niile nọ na ọhịa, ọbụ nwambị nwe ha ncha,
Nwa-odu na nwa-ọgụrụ, tụmadụ uze-na-ọsa,
Azụ niile hi nọ nị ịyị, ha niile bụ nke m,
Nwa-oporo na ayaraọcha, mangala na ayara ojii,
Nwụrụpịrị na Ọsụ-mkpịtị, Sụngu na ịle,
Nke na ekweghị ị bụ nke m,
Ịkuku agụrụ buru ya, buru ya, buru ya , Ịkuku agụrụ buru ya
Ka ọ dakpuo na ime ite ofe nne m .
Ofe ọma nne m na etere m,
Ofe ụgbọgụrụ na mtụrụkpa,
Ọkọrọ-ụgba na ụgụ-manụ,
Ofe-ụha na ofe-ogiri,
M gụta ụkpara, m gụta ayara,
M gụta ịle, m gụta sụngu,
M gụta anụ-oke, m gụta azụ,
Ka nri nne m jiri bụrụ erichaa atabie aka,
Na erichaa, e bie ubiri, bie kọrọrọ .
</div>
Note; The culture of a man is like his shadows, no man can run away from his own shadows.
Click the link below to proceed to the next post.
Comments
Post a Comment