EKE NWE ỌHỊA---IGBO POEM
Written and performed by;
Mazi Mikde Ngozi Osuji
Tel; +2348033865418
Email; Osujimichael60@gmail.com
Eke nwe oke ọhịa, Mgbada nwe ụkwụ ọsọ
Ọsọ Mgbada bụ ọsọndụ, ọsọndụ anaghị agwuike
Azụ nwe ime mmiri, oshimiri bụ oke iyi
Nnụnụ nwe eluigwe, eluigwe bụ ala nnụnụ
Ewi nwe ime ọnụ, ime ala bụ ụlọ ewi
Elu mkwụ bụ ala ọsa, elu ngwọ bụ ala uze
Nkwụoka bụ ụlọ egbe, elu ọjị bụ ulọ ugo
Egbe mara mma n'eri ọkụkọ
Ugo mara mma n'eri awọ
Ndi mmụọ nwe ime abali, abalị di m egwu
Mmadụ nwe eluwa, ụbọchị bụ nke ha
Mmadụ ketere iri anụ, anụ bụ nri ọnụ
Anụmanụ n'ata achara, achara bụ nriọfia
Ịhe niile nwere oge, oge eji eme mmemme
Ụbọchị bụ oge ọlụlụ, ọlụlụ n'enye ndụ
Abali bụ oge ụra, ụra bụ oge nzimike
Ufuru bụ nri ụkpara, ụkpara bụ nri nnụnụ
Nnụnụ bụ nri agwọ, agwọ bụ nri agụ
Agụ bụ eze ọhịa, Agụ anaghị ata achara
Achara bụ nri eghu, eghu bụ nri agụ
Chineke kere agụ, ama kwe ka ọtaa achara
Agụ n'achị obodo, obodo ụmụ anụmanụ
Achara bụ nri atụrụ, atụrụ bụ nri agụ
Agụ n'achị obodo, obodo anụ ọhịa
Nke ojidere ya adọgbuo, ha ncha bụ nri agụ
Click the link below to proceed to the next post.
Very inspiring piece of Igbo poetry with a musical tonic for evening entertainment
ReplyDelete