Skip to main content

EKE NWE ỌHỊA--IGBO POEM

EKE NWE ỌHỊA---IGBO POEM
Written and performed by;
Mazi Mikde Ngozi Osuji
Tel; +2348033865418
Email; Osujimichael60@gmail.com
Eke nwe oke ọhịa, Mgbada nwe ụkwụ ọsọ
Ọsọ Mgbada bụ ọsọndụ, ọsọndụ anaghị agwuike
Azụ nwe ime mmiri, oshimiri bụ oke iyi
Nnụnụ nwe eluigwe, eluigwe bụ ala nnụnụ
Ewi nwe ime ọnụ, ime ala bụ ụlọ ewi
Elu mkwụ bụ ala ọsa, elu ngwọ bụ ala uze
Nkwụoka bụ ụlọ egbe, elu ọjị bụ ulọ ugo
Egbe mara mma n'eri ọkụkọ
Ugo mara mma n'eri awọ
Ndi mmụọ nwe ime abali, abalị di m egwu
Mmadụ nwe eluwa, ụbọchị bụ nke ha
Mmadụ ketere iri anụ, anụ bụ nri ọnụ
Anụmanụ n'ata achara, achara bụ nriọfia
Ịhe niile nwere oge, oge eji eme mmemme
Ụbọchị bụ oge ọlụlụ, ọlụlụ n'enye ndụ
Abali bụ oge ụra, ụra bụ oge nzimike
Ufuru bụ nri ụkpara, ụkpara bụ nri nnụnụ
Nnụnụ bụ nri agwọ, agwọ bụ nri agụ
Agụ bụ eze ọhịa, Agụ anaghị ata achara
Achara bụ nri eghu, eghu bụ nri agụ
Chineke kere agụ, ama kwe ka ọtaa achara

Agụ n'achị obodo, obodo ụmụ anụmanụ
Achara bụ nri atụrụ, atụrụ bụ nri agụ
Agụ n'achị obodo, obodo anụ ọhịa
Nke ojidere ya adọgbuo, ha ncha bụ nri agụ

Click the link below to proceed to the next post.

Click here to visit next post

Comments

  1. Very inspiring piece of Igbo poetry with a musical tonic for evening entertainment

    ReplyDelete

Post a Comment

Popular posts from this blog

THE SHIVERING ELEPHANT--FOLKTALES FROM IGBOLAND

THE SHIVERING ELEPHANT FOLKTALES FROM IGBOLAND Written by Mazi Michael Ngozi Osuji. Email;  osujimichael60@gmail.com , Tell; +2348033865418. Once upon a time there was a certain elephant that was feeling terribly cold and feverish in the jungle. The cold was so much that the elephant could no longer contain it, and so he needed a shelter and warmth It was the great season of harmatan, and the season had brought with it some form of unbearable cold, and chilling dews, were falling from the sky with the atmosphere covered in thick black smoke.  The chilling cold, forced people to remain indoors within their houses. The people also made fires in their houses in order to keep warmth and to fight the raging cold weather. Meanwhile, there was a hunter who lived in the jungle. He built a hut in the jungle where he lived with his family. Like other families, the hunter also made fires in his hut in order to keep the hut warm and to combat the ragi...

THE BASTARDIZATION OF THE THRONE OF IGWE IN I GBO LAND

THE BASTARDIZATIOM OF THE THRONE OF IGWE IN IGBOLAND The throne of Igwe or Eze in Igbo land is traditional and ancestral. The Eze stool is meant to be sacred and full of divinity and power. It was the oracle that chose who would be king of his people in Igbo land. The traditional Igbo stool enjoyed unadulterated divinity, and sacrosanctity and power, which had direci spiritual link with the gods. THE IGWE STOOL IS ANCESTRAL AND TRADITIONAL AND NOT POLITICAL The Nze-na-Ọzọ title holders constitute  the king makers whose duty was to prepare the chosen king according to the demand of traditional tenets of the land. A chosen Eze or Igwe was usually subjected to series of oaths,and rituals to prepare him for the onerous task of the Eze or  Igwe stools in Igbo land. A new king could be chosen at infancy according to the wishes of the oracle. Igbo kings were not enthroned by virtue of age, height or wealth but by the dictates of the gods who chooses whoever pleased them i...